12. Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.
13. Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:Npako, na nganga, na uzo ọjọ,Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.
14. Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.
15. Mu ka ndi-eze ji abu eze,Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.
16. Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.
17. Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya;Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.
18. Àkù na nsọpuru di n'akam;E, àkù nke nādigide na ezi omume.
19. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.
20. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:
21. Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.
22. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.
23. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,Tutu uwa adi.
24. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.
25. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala,Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: