17. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.
18. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.
19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.
20. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.
21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;
22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.
23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,
24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
25. Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:
26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.
27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.
28. Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.
29. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.