4. Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:
5. Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.
6. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:
7. O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;
8. Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.
9. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.
10. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
11. Ìzùzù ganēche gi nche,Nghọta gēchebe gi:
12. Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;