Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma.