16. Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.
17. Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.
18. Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:N'ihi ndi-irom b͕aputam.
19. Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.
20. Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula;M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.
21. Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.
22. Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.
23. Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.
24. Wukwasi ha iwe-Gi,Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.
25. Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu;Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha.
26. N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.
27. Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.
28. Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.