8. Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.
9. Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di;Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.
10. Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.
11. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;
12. Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.
13. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.
14. Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.
15. Anya ihe nile nēle anya Gi;Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.
16. I nāsaghe aka-Gi,I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.
17. Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile,Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.
18. Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.
19. Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.
20. Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya;Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.