10. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;
11. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:
12. O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.
13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.
14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.
15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.
17. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.
18. Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.
19. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha na nkpà-ha nile.