22. Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema.
23. O we je n'ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema.
24. Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?