3. Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud;
4. na Abishua, na Neaman, na Ahoa;
5. na Gira, na Shefufan, na Huram.
6. Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:
7. na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.
8. Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.
9. O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam;
10. na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna.
11. O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal.
12. Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:
13. na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;