5. Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu.
6. Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ.
7. Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ.
8. Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.
9. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.
10. Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.
11. Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha.
12. Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.
13. Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.
14. Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:
15. Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.
16. Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.
17. Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.
18. Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.
19. Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam.
20. Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya,
21. na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n'ala, b͕uru, n'ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha.