50. Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;
51. Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;
52. Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;
53. Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.
54. Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,
55. ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;
56. ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.
57. Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;
58. na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;
59. na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:
60. site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.