46. nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea;
47. nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai.
48. Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.
49. Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.
50. Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya;
51. Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya;
52. Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya;
53. Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.
54. Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,
55. ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;
56. ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.
57. Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;
58. na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;