5. na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya.
6. Amu-kwa-ra umu-ndikom nye Shemaia nwa-ya, ndi nāchi ulo nna-ha: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha bu.
7. Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia.
8. Ndia nile sitere n'umu Obed-edom: ha onwe-ha na umu-ha ndikom na umu-nne-ha, ndikom bu dìnkpà n'ike ifè òfùfè; ọgu ndikom atọ na abua nke Obed-edom nwere.
9. Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom na umu-nne, ndi-dìnkpà, iri na asatọ.
10. Hosa, onye sitere n'umu Merari, nwe-kwa-ra umu-ndikom; Shimri bú onye-isi, (n'ihi na ọ bu ezie na ọ bughi ọkpara, ma nna-ya mere ya onye-isi;)
11. na Hilkaia, bú nke-abua, na Tebalia, bú nke-atọ, na Zekaraia, bú nke-anọ: umu-ndikom na umu-nne nile nke Hosa nwere di iri na atọ.
12. Nke ndia ka òkè nile nke ndi-ọnu-uzọ-ama bu, bú nke ndi-isi nke ndi di ike nwere ihe-ndebe ọbuná dika umu-nne-ha, ije ozi n'ulo Jehova.
13. Ha we fe nzà, ma onye ntà ma onye uku, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bayere ọnu-uzọ-ama ọ bula.
14. Ife-nzà n'akuku ọwuwa-anyanwu we ma Shelemaia. Ha fe-kwa-ra nzà bayere Zekaraia nwa-ya, bú onye nādu ọdu nke nwere uche; ife-nzà-ya we puta n'akuku Ugwu.
15. Ife-nzà nke Obed-edom putara n'akuku Ndida; nke umu-ya ndikom puta-kwa-ra n'ulo nchikọta-ihe.
16. Nke Shupim na nke Hosa putara n'Ọdida-anyanwu, n'akuku ọnu-uzọ-ama Shaleket, n'uzọ atuliri atuli nke nārigo, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.
17. Ndi Livai isi nọ n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'akuku Ugwu ha di anọ kwa-ubọchi, n'akuku Ndida ha di anọ kwa-ubọchi, ha di-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe abua abua kwa-ubọchi.
18. N'èzí ulo n'akuku Ọdida-anyanwu ha di anọ n'uzọ atuliri atuli, abua n'èzí ulo.
19. Ndia bu òkè ndi-ọnu-uzọ-ama; nke umu ndi Kora, na nke umu Merari.
20. Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.
21. Umu-ndikom Ladan; umu ndi Giashon, bú ndi Ladan nwere, ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Ladan onye Giashon nwere; Jehieli.