7. Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.
8. O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.
9. Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.
10. Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n'ulo Degon.
11. Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,
12. ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.
13. Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,
14. ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.