Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Taitọs 2:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi nēme ihe gātọ ha ezi utọ n'ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha;

10. ghara itutu aka, kama ka ha nēgosi ezib͕o ikwesi-ntukwasi-obi nile; ka ha we chọ ozizí nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nma n'ihe nile.

11. N'ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa,

12. nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a;

13. nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;

14. Onye nyere Onwe-ya n'ihi ayi, ka O we b͕aputa ayi n'imebi-iwu nile, sachakwara Onwe-ya otù ndi nke gābu ndi nke aka Ya, ndi obi-ha nānuru ọlu ọma ọku.

15. Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n'anya, n'inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Taitọs 2