Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Taitọs 2:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:

7. n'ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru,

8. okwu nke nēnye ezi ndu, nke anāpughi ima ikpe; ka ewe me onye nọ n'akuku ndi nēmegide emegide ihe-ihere n'iru, ebe ọ nēnweghi ihe nādighi nma ikwu bayere ayi.

9. Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi nēme ihe gātọ ha ezi utọ n'ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha;

10. ghara itutu aka, kama ka ha nēgosi ezib͕o ikwesi-ntukwasi-obi nile; ka ha we chọ ozizí nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nma n'ihe nile.

11. N'ihi na egosiri amara nke Chineke, nēwetara madu nile nzọputa,

12. nādọ ayi aka na nti ka ayi we ju asọpurughi-Chineke na agu ihe ọjọ di n'uwa, we di ndu uche zuru okè na nke ezi omume na nke isọpuru-Chineke n'oge di ub͕u a;

13. nēche olile-anya ahu di ngọzi na ngosi nke ebube nke Chineke uku ahu, Nke bu kwa Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Taitọs 2