Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Taitọs 2:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma gi onwe-gi, nēkwu ihe nile kwesiri ozizí ahu nke nēnye ezi ndu:

2. si ka agadi-ndikom nwe anya-udo, kwesiri nsọpuru, nwe uche zuru okè, nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi, nime ihu-n'anya, nime ntachi-obi:

3. otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma;

4. ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya,

5. ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke:

6. otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:

7. n'ihe nile nēme onwe-gi ihe-atù nke ọlu ọma; nime ozizí-gi nēgosi emebighi-emebi, ikwesi-nsọpuru,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Taitọs 2