Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Taitọs 1:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke,

2. n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue;

3. ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n'oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n'aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n'iwu si di;

4. Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.

5. N'ihi nka ka m'rapuru gi na Krit, ka i we dozie ihe fọduru, do kwa madu ndi-okenye n'obodo nile ọ bula, dika mu onwem nyere gi iwu;

6. ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n'iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n'okpuru iwu.

7. N'ihi na onye ahu nke nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anāpughi ibo ebubo, dika onye nāchi èzí-na-ulo Chineke; onye nābughi onye nwere isi-ike, nābughi onye nēwe iwe ọsọsọ, nābughi onye nēse okwu site n'iṅubiga manya ókè, nābughi onye nēti madu aka, nābughi onye akpiri urù nēweta ihere nākpọ nku;

8. kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;

9. nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Taitọs 1