Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 9:10-15 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n'ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi.

11. Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n'ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n'ihi na le, ọ nēkpe ekpere;

12. ọ hu-kwa-ra otù nwoke, aha-ya bu Ananaias, ka ọ nābata, nēbikwasi kwa ya aka-ya abua n'isi, ka ewe me ka ọ hu uzọ.

13. Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n'ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem:

14. n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u.

15. Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 9