Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 9:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà,

2. riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.

3. Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n'elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu:

4. o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?

5. O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u:

6. ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.

7. Ndikom ndi soro ya n'ije we guzo apughi ikwu okwu, ebe ha nānu olu ahu, ma ha ahughi onye ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 9