5. Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:
6. ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.
7. Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.
8. Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju.
9. Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju.
10. Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu.
11. Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke.
12. Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé,
13. we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi:
14. n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka.
15. Ndi nile ndi nọduru na nnọkọ-ikpé ahu, mb͕e ha legidere ya anya, ha we hu iru-ya dika ọ bu iru mọ-ozi.