Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.