Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 4:19-26 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke:

20. n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa.

21. Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.

22. N'ihi na nwoke a b͕ara kari ọgu arọ abua, bú onye emereri ihe-iriba-ama nka n'aru-ya, bú ime ka aru-ya di ike.

23. Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri.

24. Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

25. Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si,N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu,Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?

26. Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù,Ndi-isi zukọ-kwa-ra,Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 4