Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 4:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n'èzí, ha b͕a ìzù n'etiti onwe-ha,

16. si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n'ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n'aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya.

17. Ma ka o we ghara ib͕asa kari n'etiti ndi-Ju, ka ayi bara ha nba, ka ha ghara igwa madu ọ bula okwu n'aha nka site n'ub͕u a.

18. Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus.

19. Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke:

20. n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa.

21. Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 4