1. Ma Pita na Jọn nārigo n'ulo uku Chineke n'oge hour ekpere, bù oge hour nke-iteghete.
2. Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n'aka ndi nābà nime ulo uku Chineke;
3. onye, mb͕e ọ huru Pita na Jọn ka ha gaje ibà n'ulo uku Chineke, ọ kpe ekpere inata onyinye-ebere.
4. Ma Pita, ka ya na Jọn nēlegide ya anya, ọ si, Le ayi anya.
5. O we riba ha ama, nēle anya inata ihe n'aka-ha.
6. Ma Pita siri, Ọ dighi ọla-ọcha na ọla-edo m'nwere; ma ihe m'nwere, nke ahu ka m'nēnye gi. N'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, je ije.
7. O we jide ya n'aka-nri, palie ya: ngwa ngwa ukwu-ya abua na nkwonkwo-ukwu-ya we nwe ume.
8. O we wulie elu, guzo, je kwa ije; o we so ha ba n'ulo uku Chineke, nēje ije, nāwuli kwa, nēto kwa Chineke.