Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 28:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Otú ọ di, o febàra anu-ọhia ahu nime ọku, ma ọ dighi ihe ọjọ meruru ya aru.

6. Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n'ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi.

7. Ma n'ala di ab͕ata ebe ahu onye-isi agwe-etiti ahu, aha-ya bu Pọbliọs, nwere iberibe ala ufọdu; onye nara ayi nke-ọma, were kwa obi-ọma le ayi ọbìa ubọchi atọ.

8. O we rue, na nna Pọbliọs nēdina, aru-ọku na ọnyunyu-ọbara jidesiri ya ike: onye Pọl bakutere, we kpe ekpere, bikwasi ya aka abua me ka aru di ya ike.

9. Mb͕e emere nka, ndi fọduru n'agwe-etiti ahu ndi nāria nriaria we biakute ya, ewe me ka aru-ha di ike:

10. ha we were kwa ọtutu nsọpuru sọpuru ayi; mb͕e ayi nupuru ub͕ọ, ha we tiye n'ub͕ọ ihe nile di ayi nkpà.

11. Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e.

12. Ayi we rue ala na Sairakus, we nọgide n'ebe ahu ubọchi atọ.

13. Ayi we site n'ebe ahu ga buruburu, we rue Rijiọm: mb͕e otù ubọchi gasiri ifufe Ndida we febe, n'ubọchi nke-abua ayi we bia rue Pọtiọli:

14. ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom.

15. Umu-nna-ayi nime Kraist, mb͕e ha nuru ihe bayere ayi, ha we bia izute ayi rue Ahia Apiọs, na Ulo-ndi-ije Atọ: mb͕e Pọl huru ha, o kele Chineke, nwe kwa obi-ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 28