Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 27:23-33 Bible Nso (IGBOB)

23. N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,

24. si, Atula egwu, Pọl; i ghaghi iguzo n'iru Sisa: le kwa, Chineke ewerewo amara nye gi ndi nile gi na ha nānọ n'ub͕ọ.

25. N'ihi nka, ndikom, nwenu obi-utọ: n'ihi na ekwerem Chineke, na ọ gādi otú a ọbuná dika agwaworom.

26. Otú ọ di aghaghi itupu ayi n'elu otù agwe-etiti.

27. Ma mb͕e o ruru abali nke-iri-na-anọ, mb͕e ayi nērughari n'osimiri Adria, dika etiti abali ndi-ub͕ọ chère na ha nābiaru otù ala nso;

28. ha we tù oké osimiri, hu na ọ bu orú mbudu: mb͕e oge ntà gasiri, ha we tù ọzọ, hu mbudu iri na ise.

29. Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n'ala nkume, ha we rada arilika anọ n'isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ.

30. Mb͕e ndi-ub͕ọ nāchọ uzọ isi n'ub͕ọ b͕apu, mb͕e ha wedasi-kwa-ra ub͕ọ ntà n'oké osimiri, nēme dika ha gaje iseti arilika n'ọnu-ub͕ọ,

31. Pọl we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise na ndi-agha, Ọ buru na ndia anọgideghi n'ub͕ọ, apughi izọputa unu onwe-unu.

32. Mb͕e ahu ndi-agha bipuru udọ̀ ub͕ọ ntà ahu, we rapu ya ka ọ dapu.

33. Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n'ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 27