Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 26:5-21 Bible Nso (IGBOB)

5. ebe ha buru uzọ maram site na mbu, ọ buru na ha chọrọ ib͕a àmà, na adim ndu ka onye-Farisi dika irọ-òtù ahu si di nke nēdebezu iwu kari n'uzọ ikpere Chineke ayi.

6. Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;

7. bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!

8. Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?

9. N'ezie mu onwem chère n'obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret.

10. Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.

11. Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.

12. N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà,

13. n'etiti ehihie, eze, ahurum n'uzọ ìhè sitere n'elu-igwe, kariri onwunwu anyanwu, ka ọ nēnwu mu na ndi sorom n'ije buruburu.

14. Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.

15. Mu onwem we si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we si, Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.

16. Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha;

17. nēweputa gi n'aka ndi-Ju, na n'aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha,

18. isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.

19. Site n'ihe ndia, eze Agripa, abughm onye nādighi-ekweye ọhù ahu nke elu-igwe:

20. kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.

21. Ọ bu n'ihi ihe ndia ka ndi-Ju jiderem n'ulo uku Chineke, we nwa ib͕um.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 26