Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 26:26-32 Bible Nso (IGBOB)

26. N'ihi na eze mara ihe bayere ihe ndia, onye m'nāgwawa kwa okwu: n'ihi na emere ka m'kweye na ọ dighi ihe ọ bula n'ihe ndia ezonariri ya; n'ihi na emeghi ihe a na nkuku.

27. Eze Agripa, ì kwere ndi-amuma? amataram na i kwere.

28. Agripa we si Pọl, I nēji okwu ntà eme ka m'kweye ibu Kristian.

29. Pọl we si, Anamekpere Chineke ka, ma ọ bu n'iji okwu ntà ma-ọbu n'iji okwu uku, ọ bughi nání gi onwe-gi, kama ọ bu kwa ndi nile nānu olum ta, gāghọ aha madu mu onwem bu kwa, ma-ọbughi ab͕u ndia.

30. Eze we bilie, ya na onye-isi, na Banaisi, na ndi ha na ha nọduru:

31. mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, we kwurita n'etiti onwe-ha, si; Nwoke a emeghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.

32. Agripa we si Festọs, Apuru irapu nwoke a ka ọ la, ma ọ buru na ọ kpọkughi Sisa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 26