Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 22:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie.

6. O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu.

7. M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?

8. Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.

9. Ma ndi mu na ha nọ kiliri ìhè ahu n'ezie, ma ha anughi olu Onye ahu nāgwam okwu.

10. M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me.

11. Mb͕e m'nāhughi uzọ site ebube ìhè ahu, ndi mu na ha nọ we jidem n'aka durum, m'we ba na Damaskọs.

12. Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà,

13. o we biakutem, guzo n'akukum, sim, Sọl, nwa-nnam, ka eme ka i hu uzọ. N'otù oge hour ahu ewe me ka mu onwem hu uzọ, m'we le ya anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 22