Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 22:17-30 Bible Nso (IGBOB)

17. O we rue, mb͕e m'laghachisiri na Jerusalem, mb͕e m'nēkpe kwa ekpere n'ulo uku Chineke, na ihe di ka inyoghi biaram n'anya,

18. m'we hu Ya ka Ọ nāsim, Me ngwa, si na Jerusalem pua ọsọsọ: n'ihi na ha agaghi-anara àmà bayerem n'aka-gi.

19. Mu onwem we si, Onye-nwe-ayi, ha onwe-ha mara na mu onwem nātubà ndi kwere na Gi n'ulo-nkpọrọ, nēti kwa ha ihe n'ulo-nzukọ nile n'otù n'otù:

20. mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya.

21. O we sim, Ga ije-gi: n'ihi na Mu onwem gēsi n'ebe a zipu gi jekuru ndi mba ọzọ n'ebe di anya.

22. Ha nānu kwa olu-ya rue okwu a; ha we welie olu-ha elu, si, Wepu onye di otú a n'uwa: n'ihi na o kwesighi ka ọ di ndu.

23. Mb͕e ha nēti nkpu, nēyipu kwa uwe-ha, nēkpoli kwa àjà elu,

24. onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a.

25. Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé?

26. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nuru ya, ọ jekuru onye-isi-ọchi-agha, kọrọ ya, si, Gini ka i gaje ime? n'ihi na nwoke a bu onye Rom.

27. Onye-isi-ọchi-agha ahu we biakute ya, si ya, Gwam, gì onwe-gi bu onye Rom? Ọ si, E.

28. Onye-isi-ọchi-agha we za, si, Oké ego ka mu onwem ji zuta ọnọdu onye amuru n'obodo Rom. Pọl we si, Ma amuru mu onwem onye Rom.

29. Ya mere ndi gaje ichọputa isi okwu n'ọnu-ya si n'ebe ọ nọ pua ngwa ngwa: onye-isi-ọchi-agha we tu kwa egwu, mb͕e ọ matara na ọ bu onye Rom, na n'ihi na o kere ya-ri ab͕u.

30. Ma n'echi-ya, ebe o nēzube imara isi okwu, ihe mere ndi-Ju nēbo ya ebubo, ọ tọpuru ya, we gwa ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé nile ka ha b͕akọ, ọ we kudata Pọl, guzo ya n'iru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 22