Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 21:4-14 Bible Nso (IGBOB)

4. Mb͕e ayi chọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, ayi we nọgide n'ebe ahu ubọchi asa: ndi ahu we gwa Pọl site na Mọ Nsọ, ka ọ ghara izọbà ukwu na Jerusalem.

5. Ma mb͕e o ruru na ayi nọzuru ubọchi ahu, ayi pua ga ije; ha nile, ha na nwunye-ha, na umu-ha, we dupu ayi n'ije-ayi, rue azu obodo-ha: ayi we b͕ue ikperè n'ala n'ótú, kpere Chineke,

6. we kelerita ibe-ayi ekele ikpe-azu; ayi we ba n'ub͕ọ, ma ndi ahu laghachiri n'ulo-ha.

7. Mb͕e ayi onwe-ayi jedebesiri ije-ayi n'ub͕ọ site na Taia, ayi we rue Tọlemais; ayi we kele umu-nna nime Kraist, ayi na ha we nọgide otù ubọchi.

8. Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.

9. Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.

10. Mb͕e ayi nānọgide n'ebe ahu ọtutu ubọchi, otù onye-amuma, aha-ya bu Agabọs, we si na Judia ridata.

11. O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.

12. Mb͕e ayi nuru ihe ndia, ayi we riọ ya, ma ayi onwe-ayi ma ndi ebe ahu, ka ọ ghara irigoro Jerusalem.

13. Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.

14. Mb͕e ọ juru ikweye, ayi we kpuchie ọnu, si, Ka eme ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 21