Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 21:27-33 Bible Nso (IGBOB)

27. Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,

28. nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.

29. N'ihi na ha buri uzọ hu ya na Trọfimọs onye Efesọs n'obodo, onye ha nēchè na Pọl dubatarari n'ulo uku Chineke.

30. Obodo ahu dum we me uṅara, ndi-Ju we b͕akọta: ha we jide Pọl, dọkpupu ya n'ulo uku Chineke: ngwa ngwa ewe mechie ọnu-uzọ nile.

31. Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara.

32. Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.

33. Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 21