Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 18:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi;

21. ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.

22. Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk.

23. Mb͕e ọ nọsiri n'ebe ahu oge ufọdu, ọ pua, we nāgabiga nime ala Galetia na Frijia n'usoro, nēme ka ndi nile ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike.

24. Ma otù onye-Ju, aha-ya bu Apọlos, onye Aleksandria n'ọmumu, nke bu onye-ọ̀kà-okwu, biaruru Efesọs; ọ di kwa ike n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.

25. Ejiri okwu-ọnu zí nwoke a uzọ Onye-nwe-ayi; ebe ọ di ọku na mọ-ya, o we nēkwu nēzí kwa nke-ọma ihe nile bayere Jisus, ọ bu ezie na ọ mara nání baptism nke Jọn:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 18