Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 17:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n'aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la.

10. Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.

11. Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.

12. Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom.

13. Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri.

14. Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.

15. Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.

16. Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi.

17. Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.

18. Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.

19. Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?

20. N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 17