Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 17:2-19 Bible Nso (IGBOB)

2. Pọl dika ọ nēme mb͕e dum, we bakuru ha, ogologo ubọchi-izu-ike atọ ọ nāgwa kwa ha okwu site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ,

3. nēmeghe ha, nēche kwa n'iru ndi ahu, na Kraist-ha aghaghi ihu ahuhu, na isi na ndi nwuru anwu bilie; nēgosi kwa na Jisus nka, Onye mu onwem nēkwusara unu, ka o kwuru, bu Kraist ahu.

4. Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha.

5. Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu.

6. Ma mb͕e ha nāchọtaghi ha, ha dọkpuru Jeson na umu-nna nime Kraist ufọdu ga n'iru ndi-isi obodo, nēti nkpu, si, Ndia, bú ndi kpùru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n'ebe a;

7. ndi Jeson kpọbataworo: ndia nile nēmegide kwa iwu nile nke Sisa, ebe ha nāsi na Eze di iche di, bú Jisus.

8. Ha we me ka obi lọ ìgwè madu ahu na ndi-isi obodo miri, mb͕e ha nuru ihe ndia.

9. Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n'aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la.

10. Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.

11. Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.

12. Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom.

13. Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri.

14. Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.

15. Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.

16. Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi.

17. Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.

18. Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.

19. Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 17