Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 15:7-19 Bible Nso (IGBOB)

7. Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha,Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa.

8. Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi;

9. ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe.

10. Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?

11. Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha.

12. Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.

13. Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si,Umu-nnam, nurunu olum:

14. Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi.

15. Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si,

16. Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi,M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada;Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ,M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ:

17. Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi,Ha na mba nile, ndi aguru aham,

18. Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a.

19. N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 15