Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 15:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha.

12. Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.

13. Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si,Umu-nnam, nurunu olum:

14. Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi.

15. Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si,

16. Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi,M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada;Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ,M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 15