Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 15:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.

2. Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.

3. Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.

4. Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.

5. Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses.

6. Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a.

7. Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha,Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa.

8. Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi;

9. ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe.

10. Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?

11. Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha.

12. Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.

13. Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si,Umu-nnam, nurunu olum:

14. Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 15