Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 14:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma mb͕e ndi nēso uzọ Jisus guzoro ya buruburu, o bilie, ba nime obodo: n'echi-ya ya na Banabas we pua ga Dabe.

21. Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk,

22. nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.

23. Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.

24. Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia.

25. Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;

26. ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.

27. Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 14