30. Ma Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie:
31. ewe me ka ha hu Ya ọtutu ubọchi, bú ndi soro Ya si na Galili rigoro Jerusalem, ndi buru ndi-Ju ndi-àmà-Ya ub͕u a.
32. Ayi onwe-ayi nēzì kwa unu ozi ọma nke nkwa ahu ekwere nna-ayi-hà,
33. na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta.