Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 12:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma mb͕e ọ matara olu Pita, o megheghi ọnu-uzọ-ama n'ihi ọṅù, ma ọ b͕abàra nime ulo, kọrọ ha na Pita guzoro n'iru ọnu-uzọ-ama.

15. Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya.

16. Ma Pita nākugide aka n'ọnu-uzọ: mb͕e ha meghesiri, ha hu ya, ibobo we nwua ha n'aru.

17. Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche.

18. Ma mb͕e chi bọrọ, ọ bughi nkpasu ntà putara n'etiti ndi-agha, ihe mere Pita.

19. Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu.

20. Ma Herod nēbu agha nke-uku megide Taia na Saidon n'obi-ya: ha we were otù obi biakute ya; mb͕e ha mesiri Blastọs eyì-ha, nke bu onye nēle ime-ulo-ndina nke eze anya, ha we riọ ka udo di n'etiti ha, n'ihi na esi n'ala nke eze ahu azù ala-ha.

21. N'ubọchi akara àkà Herod we yikwasi uwe nke eze, nọkwasi n'oche-ikpé, gwa ha okwu.

22. Ọra madu we tie nkpu, si, Ọ bu olu chi, ọ bughi kwa olu nke madu.

23. Ngwa ngwa mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we tie ya ihe, n'ihi na ọ nyeghi Chineke otuto ahu: ikpuru we tab͕ue ya, o we kubìe ume.

24. Ma okwu Chineke nāga n'iru, nāba kwa uba.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 12