Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 11:18-30 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu.

19. Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju.

20. Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.

21. Aka Onye-nwe-ayi we so ha: oké ìgwè ndi kwere we chigharikute Onye-nwe-ayi.

22. Akukọ bayere ha we ba na nti nzukọ Kraist di na Jerusalem: ha we zipu Banabas ije rue Antiọk:

23. onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:

24. n'ihi na ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe: ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi.

25. O we pua je Tasọs ichọ Sọl:

26. mb͕e ọ chọtara ya, o we kuru ya bia Antiọk. O we rue, na ọbuná ogologo otù arọ ha zukọrọ na nzukọ Kraist, zí kwa oké ìgwè madu ihe; na ọ bu kwa n'Antiọk ka eburu uzọ kpọ ndi nēso uzọ Jisus ndi-Kristian.

27. Ma na mb͕e ahu ndi-amuma ufọdu siri na Jerusalem ridata n'Antiọk.

28. Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs.

29. Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:

30. nke ha me-kwa-ra, nēzigara ndi-okenye site n'aka Banabas na Sọl.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 11