Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:25-28 Bible Nso (IGBOB)

25. Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya.

26. Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu.

27. Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri:

28. o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10