Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Otù olu we bia rue ya nti, si, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.

14. Ma Pita siri, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m'riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha.

15. Otù olu we bia rue ya nti ọzọ nke ub͕ò abua, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú.

16. Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n'elu-igwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10