Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali,

2. onye nāsọpuru Chineke, onye ya na èzí-na-ulo-ya nile nātu kwa egwu Chineke, onye nālu ọtutu ọlu ebere nye ndi-Ju, nēkpe-kwa-ra Chineke ekpere mb͕e nile.

3. Ọ huwara n'ọhù, n'ihe ra ka oge hour nke-iteghete n'ehihie, mọ-ozi nke Chineke, ka ọ nābiakute ya, nāsi kwa ya, Kọniliọs.

4. O we legide ya anya, tu kwa egwu, si, Ọ̀ bu gini, Onye-nwe-ayi? Ọ si ya, Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe-ncheta n'iru Chineke.

5. Ub͕u a ziga kwa ndikom na Jọpa, kpọta otù onye, bú Saimon, onye anākpọ kwa Pita:

6. onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo otù onye, bú Saimon, onye nēdozi akpukpọ anu, onye ulo-ya di n'usọ oké osimiri.

7. Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile;

8. mb͕e ọ kọsiri ha ihe nile, o we ziga ha na Jọpa.

9. Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:

10. agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n'anya;

11. o we hu elu-igwe ka emeghere ya-ri, ya na otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha, anēsi na nkuku anọ eweda ya n'ala:

12. nke anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu nke ala na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche di nime ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10