Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha.