Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 9:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m'we hu kpakpando nke sitereri n'elu-igwe da n'uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.

2. O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n'olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n'anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.

3. Igurube we si n'anwuru-ọku ahu puta je n'uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.

4. Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 9