Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 22:16-21 Bible Nso (IGBOB)

16. Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.

17. Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.

18. Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:

19. ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n'osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n'obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n'akwukwọ a.

20. Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.

21. Ka amara Onye-nwe-ayi Jisus diyere ndi nsọ nile. Amen.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 22