Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 21:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.

2. M'we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, site n'ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya.

3. M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:

4. Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.

5. Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.

6. O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n'isi-iyi miri nke ndu ahu n'efu.

7. Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M'gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 21